Joel 3

Ikpe nke mba niile

1“Nʼihi na, lee, nʼụbọchị ahụ, nʼoge ahụ,
mgbe m ga-eweghachi akụnụba nke Juda na Jerusalem,
2na m ga-achịkọta mba niile nke ụwa,
mee ka ha zukọọ na Ndagwurugwu Jehoshafat.
Ihe aha a pụtara bụ, onyenwe anyị na-ekpe ikpe

Nʼebe ahụ, ka mụ onwe m ga-ama ha ikpe,
nʼihi ihe ha mere ihe nketa m, na ndị nke m Izrel.
Nʼihi na ha chụsasịrị ndị m nʼetiti mba niile,
kee ala m nʼetiti onwe ha.
3Ha fere nza nʼihi ndị m,
were ụmụ m ndị nwoke gbanwere ụmụ akwụna.
Ha rere ụmụ m ndị nwanyị nʼihi mmanya, nʼihi inweta mmanya ha ga-aṅụ.
4“Ọ bụ gịnị ka unu nwere megide m, unu Taịa na Saịdọn, na unu obodo ahụ niile dị gburugburu ala ndị Filistia? O nwere ihe m mere nke unu na-akwụghachi m ụgwọ ya? Ọ bụrụ nʼezie na unu na-akwụghachi m ụgwọ, mụ onwe m ga-eji ọsọ kwụghachi unu ihe ọjọọ niile unu mere. 5Nʼihi na unu weere ọlaọcha m na ọlaedo m, burukwa ihe dị oke ọnụahịa niile m nwere, bulaa ha nʼụlọnsọ chi
Maọbụ, ụlọ ukwu unu
unu.
6Unu refuru ndị Juda na ndị Jerusalem, resi ha ndị Griik, si otu a wega ha nʼebe dị anya site nʼala ha.

7“Lee, aga m esi nʼebe ahụ unu refuru ha kpọlite ha. Aga m emekwa ka ihe ndị ahụ niile unu mere bịaghachi unu nʼisi. 8Aga m ewere ụmụ unu ndị nwoke na ndị nwanyị resi ha ndị Juda, ndị ga-eresi ha ndị Sheba, bụ mba tere anya.” Onyenwe anyị ekwuola ya.

9Kwupụtanụ nke a nʼetiti mba niile:
Jikerenụ agha!
Kpọteenụ ndị dike nʼagha.
Ka ndị agha niile a zụziri azụzi bịaruo nso ibu agha.
10Kpụgharịanụ mma oge unu ka ha bụrụkwa mma agha,
kpụgharịakwanụ mma ịkwa osisi unu ka ha ghọọ ùbe.
Ka onye na-adịghị ike kwuo sị,
“Adị m ike!”
11Chịkọta onwe unu ọsịịsọ, bịa, unu mba niile, nọ nʼebe niile.
Zukọtaanụ nʼebe ahụ.

Kpọdata ndị agha gị dị ike Onyenwe anyị!

12“Ka akpọlitekwa mba niile,
mee ka ha niile bịaruo na Ndagwurugwu Jehoshafat,
nʼihi na ọ bụ nʼebe ahụ
ka m ga-anọ kpee mba nọ nʼakụkụ niile ikpe.
13Tinye mma iwe ihe ubi,
nʼihi na mkpụrụ ubi achaala.
Bịa zọchaa mkpụrụ vaịnị,
nʼihi nʼebe ịzọcha mmanya ejula,
ebe ịnara mmanya gị niile ejubigakwala oke,
nʼihi na ajọ omume ha dị ukwuu.”

14Ọtụtụ igwe mmadụ, ọtụtụ igwe mmadụ!
Ha jupụtara na ndagwurugwu mkpebi ikpe ahụ!
Nʼihi na ụbọchị Onyenwe anyị dị nso,
na ndagwurugwu mkpebi nhọrọ ahụ.
15Anyanwụ na ọnwa ga-agbaji oji,
kpakpando agakwaghị enye ìhè.
16 Onyenwe anyị ga-ebigbọ na Zayọn,
olu ya ga-ada nʼime Jerusalem.
Elu ụwa na mbara eluigwe ga-amakwa jijiji.
Onyenwe anyị ga-abụrụ ndị ya ebe mgbaba.
Ọ ga-abụrụ ndị Izrel ebe e wusiri ike.

Ngọzị dịrị ndị nke Chineke

17“Mgbe ahụ, unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu
bi na Zayọn, nʼugwu m dị nsọ.
Jerusalem ga-abụ ebe dị nsọ.
Ndị mba ọzọ agakwaghị esite nʼime ya gabiga ọzọ.

18“Nʼụbọchị ahụ, mmanya ọhụrụ ga-esi nʼugwu ukwu niile na-atapụtasị,
mmiri ara ehi ga na-erupụtakwa site nʼugwu nta niile;
mmiri ga na-asọkwa na ndagwurugwu niile nke Juda ebe mmiri si eru.
Isi iyi ga-esitekwa nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị sọpụta
dee Ndagwurugwu Shitim.
19Ma Ijipt ga-atọgbọrọ nʼefu,
Edọm ga-aghọkwa mkpọmkpọ ebe,
nʼihi ihe ike ha mere ndị Juda,
bụ ndị ha kwafuru ọbara ndị aka ha dị ọcha nʼala ha.
20Ma Juda ga-abụ ebe mmadụ ga-ebi ruo mgbe ebighị ebi.
A ga-ebikwa na Jerusalem nʼọgbọ niile.
21Aga m ahapụ ịbọ ọbọ ọbara ha?
Mba, agaghị m agụnye onye ikpe maara dịka onye ikpe na-amaghị.

Nʼihi na Onyenwe anyị bi na Zayọn.”
Copyright information for IboBIU